Igbo Proverbs: I dabanye n'ọnọdụ ndị a, were ilu igbo ndị a kwuo okwu

  • Chioma Obianinwa
  • Senior Broadcast Journalist, Igbo
Achebe kwuru na ilu bụ mmanụ nri ndị Igbo ji eri okwu

Ebe foto si, Getty Images

Ode akwụkwọ ama ama bụ Chinua Achebe kọwara ilu dịka mmanụ nri ndị Igbo ji eri okwu.

Ọ dị mkpa ị mata mgbe maọbụ ọnọdụ ikwesiri itu ilu ọbụla ị na-atụ.

Ọ gaghị adị mma ka iwere ilu gbasara izulite ụmụaka na-atụ ebe a na-ekwu maka mkpata na mmefu ego, maọbụ were nke e kwesiri ịtụ maka alum di nwunye na-atụ mgbe a na-ekwu maka odibo na onyeisi ya.

Akukọ a ga-eme ka ị tụọ ilu n'ọnodụ ha dabara, nke a ga-ebutere gị ezigbo nkwanye ugwu, udo na ọganihu n'etiti ndị ndị ọyị, ikwu na ibe nakwa ụmụnna gị.

Ọnọdụ ndị a gụnyere alum di na nwunye, mkpata na mmefu ego, mmekọrịta odibo na onyeisi ya, ọchịchị, agwa mmadụ, mkpachapụ anya, ọzụzụ ụmụaka, igba mbo, nsọpụrụ, nri na ụgani,wdgz.

Mgwa bute oche ka anyị gosi gị ilu dị iche iche nakwa ọnodụ ndị a na-atụ ha.

Agwa mmadụ

Ụmụnwaanyị nọ n'ahịa

Ebe foto si, Getty Images

Nwaanyị makarịa di ya n'uzọ, ihe chere di ya, ewere ya.

Mpụtara: Onye ọmachancha akpachapụghị anya, ọ danye na nsogbu edowere onye ọzọ.

Wepụ aka enwe n'ofe , tupu ọ ghọọ aka mmadụ.

Mpụtara: Kwụsị ajọ agwa gị tupu ọ lapụta gị.

Otu onye siere igwe mmadụ nri, ọha ga-ericha nri ahụ mana igwe mmadụ siere otu onye nri, ọ gaghị erichanwu ya.

Mpụtara: Otu onye agaghị emeli ihe igwe mmadụ kwesiri ime.

Otu aka rụta mmanụ, o jezuo ọha.

Mpụtara: Otu onye agwa ya jọrọnjọ nwereike ịmetọsị agwa ndị ọzọ dị mma n'akụkụ ya.

Onye kpatara nkụ ahụhụ si ngwere bịara ya ọrụ.

Mpụtara: Onye kotere nsogbu, agbaala ọsọ ntaramahuhụ ga-eso ya.

Igba mbọ

Innocent Chuwkuma

Aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ

Mpụtara: Ọgba mbọ na-eri nnukwu uru

Agadị anaghị aka nka n'egwu o ma-agba.

Mmadụ anaghị aka nka n'ihe doro ya anya.

Ikwo aka tiri ọkụkọ akị.

Mpụtara: Igba mbọ n'efu

Onye gba bọọlụ, ọ racha oroma.

Naanị ọgba mbọ na-eri uru

Onye buru chi ya uzo, o gbagbue onwe ya n'oso.

Mpụtara: Ọ dịmma ikwanyere onye na-enyere gị aka ugwu tụmadị chi mere gị ihe ibụ.

Nsopuru

ụmụnwaanyị

Ebe foto si, Getty Images

Ọkụkọ na-edowe ahụ na ara na-ayị ya ahụbeghị nkịta mmanya na-egbu.

Mpụtara: Onye na-achọ ọnwụ hụ ibe ya , ndụ agụwa ya.

Ojituru m n'ala, ji onwe ya.

Mpụtara: Onye ji aghụgho eme ihe o kwesiri ime , na-egbu oge ya.

Aka nri kwọọ aka ekpe, aka ekpe akwọọ aka nri

Mpụtara: Onye kpasoo mmadụ ibe ya agwa ọma, o nwetakwa agwa ọma.

Ogologo abụghị na nwam etola.

Mpụtara: Anaghị eji etu mmadụ si topu ogologo , a mara ma ọ ma ihe.

Agwọ emeghị nke o jiri buru agwọ, ụmụaka a chiri ya hie nkụ.

Mpụtara: Ọ na-adị mma ka mmadụ were ihe ọ ma eme wee tuo onụ

Ọzuzụ ụmụaka

ụmụaka na-egwu egwu

Ọ bụghị ụbọchi nwata kwafuru mmanu ka a na-apịa ya ụtalị, kama ụbọchị ọ kwafuru mmanụ agbịdị.

Mpụtara: Agwa ọjọ nwata kpara ugboro ugboro bụ ihe na-ebutere ya ntaramahụhụ.

Okro anaghị akarị onye kụrụ ya.

Mpụtara: Nwata anaghị akarị ntuziaka nne na nna ya.

Nwata rie ihe ọ na-amụrụ anya, ụra atụọ ya.

Mpụtara: Mmadụ mee ihe na-agụ ya, o zuo ike maọbụ afọ eju ya.

Nwata kwụọ aka ya, o soro ndị okenye rie nri.

Mpụtara: Nwata ma ihe ga-eso ndị okenye rịkọọ ma ṅụkọọ maọbụ onye ma ihe ga-abanyenwu ebe ọgbọ ya agaghị abanwu.

A naghị eji ụtụtụ ama njọ ahia.

Mpụtara: Ejighị mgbe nwata pere mpe, ama ma ọ ga-ama ihe maọbụ jide nnukwu ego.

Alum di na nwunye

Ejiji ndị ndị Igbo pụụ iche nke ụkwuu

Ebe foto si, Teyannasecret/Instagram

Nkọwa foto, Ejiji ndị ndị Igbo pụụ iche nke ụkwuu

Ọgọ bịakarịa , e zie ya kpata nkụ

Mpụtara: Ọgọ na-ejekarị be ọgọ ibe ya , ga-anata mkparị makana ahukarịala ya.

Okokporo si na ahia ekwoghi ekwo o, umu ya ha di ole n'ahia?

Mputara: Nwoke maọbụ nwaanyị tozuru alụm di na nwunye, mee ya ka ha wee mụta ụmụ.

Nwanyi lelie di ya, ekwu akpo ya nku

Nwaanyị na-akparị dị ya, ga-adabanye n'ụbiam na ahụhụ.

Nwunye awo si na di atoka uto, ya jiri nuta nke ya kworo ya n'azu.

Mpụtara: E ji ilu a ama ụmụnwaanyị njakiri ka ha wee hụkwuo di ha n'anya nke ukwuu.Agbogho hokaria di ya aluo eke mmuo

Agbogho hokaria di ya aluo eke mmuo

Mpụtara: O dịghị mma ka nwaagbọghọ ghọtee di aka.

Mkpata na mmefu ego

Naira

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, EFCC kwuru na Umar chọ nde naira ịrị

A hụ ihe karịrị ubi, ere ọba ji

Onye na-ebe akwa ego hụ ihe nwereike iwere ndụ ya maọbụ nke ezinụlọ ya, o bupute akụ na ụba niile o zoro ezo.

O re-ere bụ Eze; O zu-azụ bụ ezeMmadụ: Ugwu kwesiri onye ọbụla.

Ahịa ukwu amaghị na otu onye abiaghi.Mpụtara: Ma ị gosighị ihe ị ma eme , onye na-ama gị aka ga-apụta kụchapụ gị.

Akwukwo juru n'ohia, ma a baa a choba okazi.Mpụtara: Onye biara izụ ahia nwere ebum n'obi ihe ọ chọrọ izu agbanyeghị na enwere ọtụtụ udiri ihe ahụ na-achaba ya anya.

Mkpachapụ anya

O nweghị ihe anya hụrụ gba obara.

Mpụtara: O nweghị ihe mmadụ ga-ahụ n'ụwa kwuo na ọ hụtụbeghị ya mbụ.

Awọ anaghị agba ọsọ ehihie n'efu.

Mpatara: Mmadụ anaghị ebe akwa maọburụ na onweghị

Erekwala ọkụkọ nwere otu ọkpa n'akụkụ ebe ibi.

Mpụtara: A ghọọla aghụghọ ebe ama gị ọfụma.

Chụọ ewu ojii n'ehihie

Mpụtara: Mmadụ mee ihe n'oge o kwesiri ime ihe ahụ.

Otu mkpụrụ akwụ adịghị efu n'ọkụ.A na-aka akpachapụrụ ihe pere mpe anya ọfụma karịa mgbe o juru ebe niile.

Ezinulo

Ezinụlọ

Ebe foto si, Getty Images

A na-esi n'ulọ mara mma pụọ ama.

Mpụtara: Ihe ọma ọbụla ị na-eme n'iro, malite n'ụlọ mewe ya.

Ebe a na-adụ nwa nwere nne ọdụ, ka nwa na-enweghị nne na-amụta ihe.

Mpụtara: Onye ma ihe, na-esi na nzoghie ụkwụ ndị ọzọ muta ihe.

Nne ewu na-ata igụ, ụmụ ya a na-ele ya anya n'ọnụ.

Mpụtara: Ihe ọbụla nne maọbụ nna na-eme, ha mara na ụmụ ha na-amụta n'aka ha.

Nwata na-ata akara, na-ata ego ya.

Mpụtara: Nwata na-eme isi ike, na-ebutere onwe ya nsogbu.

Amamihe

Okenye na-agụ akwụkwọ

Onye na-agakarị njem na-aka okenye n'otu ebe ama ihe nke ukwuu.

Mpụtara: Onye na-emekarị njem ga-amụta ọtụtụ ihe karịa okenye na-anokarị otu ebe.

Agbụsị gbaa otule ọ mụrụ akọ

Mpụtara: Ihe mee mmadụ mekwasa ya , ọ mụrụ akọ.

A tuọrọ ọmara, ọ mara, a tuọrọ ofeke, o fenye isi n'ọhịa

Mpụtara: Naanị onye nwere amamihe na-anara ndumọdụ mana onye nzuzu na-atacha ndụmọdụ, o zuzuru gawa.

Ukpana ukpoko gburu bụ nti chiri ya.

Mpụtara: Ị maracha ihe ikwesiri ime ma gị emeghị ya, onwe gị mejọrọ

Onye mara asụ, sụọ n'odo. Ma ị maghị asụ, sụo n'ala.

Mpụtara: Ihe ọbụla onye na-eme, ya mara eme ya ọfụma.

Nri

Abacha

Ebe foto si, 9jaDelicacies/Instagram

Nkọwa foto, Abacha bụ nrị e jiri mara ndị Enugwu steetị

Agadị wekọtacha ọkazị ma gbajie mgbọrọgwụ ya, agụ biara n'afo nke mbụ ga-abịakwa ọzọ.

Mpụtara: Erichala ihe niile inwere taa, cheta na echi dị.

O nweghị onye na-ajụ ofe azụ juputere na ya.

Mpụtara: Ihe dị mma na-amasị onye ọbụla maọbụ onweghị onye na-ahụ uru jụ ya.

Onye si na ya anaghi ata anu nkita, ya arakwala mmiri ofe ya.

Mpụtara: Ihe ọbụla na-adịghị gị mma, agakwala ya nso.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: